Peeji emelitere emelitere ikpeazụ: December 9, 2020
Eji Ethereum
I chọrọ ịmalite i di na eji Ethereum? Peeji a ga enye gi ozi di mkpa i choro.
otu. Jiri ngwa komputa aruru na ethereum
Uzọ kachasị mma iji malite na Ethereum bụ ịwụnye n'ime ya ozugbo! Enwere otutu ngwa komputa Ethereum ị nwere ike iji taa.
Nke a bụ naanị ngwa komputa ole ma ole ewuru na Ethereum - anyị na-atụgharị ndepụta a ugboro ugboro!
- Gitcoin, netwok nke agbamume nke ndi mmeputa mepere uzo
- Cent, netwok mmekorita mmadu ebe inwere ike irite ego site na itinye ozi
- Veil, ikpo okwu ahia nke na - enye gi ohere itinye nzuko na ihe omume uwa
- CryptoKitties Egwuregwu ebe ị ga anakọta ma zụo dijitalụ mkpokota pusi
- DAI, ego cryptocurrency na adighi agbanwe nke jigidere uru na $ 1 USD
Ufọdụ n'ime ngwa komputa ndị a nwere ike ịchọ akpa ego - lee ngalaba dị n'okpuru maka ozi ndị ọzọ.
Nwere mmasị ịlele ngwa komputa ndị ọzọ aruru na Ethereum?
- Aruru na Ethereum Emelitere ohuru oge niile - EthHub
- Ngwa komputa iri anọ Ethereum i nwere ike idi na eji ugbu aAug 15, 2018 - ConsenSys
- Ethereum DappsEmelitere oge niile - Steeti nke Dapps
abuo. Gini bu ETH, kedu ka m ga-esi nweta ya?
ETH bụ ego nwaafo Ethereum. Ọ bụ "ego dijitalụ" enwere ike izipu na ịntanetị ozugbo ozugbo na n'ọnụ ala, ma jikwa ya n'ọtụtụ ngwa komputa dabere na Ethereum dịka ndị ahụ dị n'elu.
Uzọ kachasị mfe iji nweta ETH bụ ịzụta ụfọdụ. Enwere ọtụtụ mgbanwe cryptocurrency ga-enyere gị ohere ịzụta ETH, mana nke ị ga eji mee ihe ga-adabere na ebe i bi na etu ịchọrọ isi kwụọ ụgwọ.
Maka inweta nkọwa ndi ozo banyere otu esi azuta ETH lelee ntuziaka ndi a:
- Otu esi azụta ether (ETH)Emelitere ohuru otutu oge- MyCrypto
- Etu esi azụta etherEmelitere ohuru otutu oge- EthHub
- Ethereum, ego dijitalụCryptoKitties
Ato. Gịnị bụ akpa ego, ma olee nke m kwesịrị iji?
Obere akpa ego bụ ngwa komputa nke na-eme ka ọ dị mfe ijide na izipu ETH, yana imekorita ya na ngwa komputa aruru na Ethereum.
Odoghi gi anya obere akpa ego iga eji? Bido na ntuziaka ndị a:
- Mwebata na Ethereum Akpa egoEmelitere ohuru otutu mgbe- EthHub
- Ibido ya MetaMaskDec 4, 2018 - MetaMask
- Etu esi emebe obere akpa ego Emelitere ohuru oge niile - MyCrypto
- Akpa ego Ethereum kachasị mma 2019: Ngwaoru komputa vs. Sọftụwia vs. AkwụkwọDec 15, 2018 - Blockonomi
Chọrọ ịmatakwu banyere ịchekwa ego ndebe na ijikwa igodo onwe?
- Ichegide Onwe Gị na Ego Gị Emelitere ohuru otutu mgbe- MyCrypto
- Uzo eji edebe crypto gị na nchekwa Jan 16, 2019 - Coinbase blog
- Etu esi echekwa akunuba dijitalụ na EthereumMay 30, 2018 - ConsenSys
- O di gi mkpa n'ezie i nweta obere akpa ego ngwaoru komputa?Sep 24, 2018 - Ledger